Psalms 35

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ;
buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha.
2Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị;
bilie bịa nyere m aka.
3Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị;
bịa zute ndị na-achụ m ọsọ.
Gwa mkpụrụobi m,
“Abụ m nzọpụta gị.”

4Mee ka ihere mee
ndị niile na-agbalịsị ike igbu m.
Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ,
na ndị ihere mere.
5Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe,
ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.
6Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị;
ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ.

7Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha,
ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.
8Ka mbibi bịakwasị ha na mberede,
ka ụgbụ ha zobeere m kee ha;
ka ha lakwaa nʼiyi site nʼidaba nʼolulu ahụ ha gwuru.
9Mgbe ahụ, mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ na Onyenwe anyị,
ọ ga-enwekwa obi ụtọ nʼime nzọpụta ya.
10Ihe niile dị nʼime m ga-eti mkpu sị,
“O Onyenwe anyị, ọ bụ onye dịka gị?
Ị na-agbapụta ndị na-adịghị ike site nʼaka ndị dị ike karịa ha,
ma na-anapụta ndị ogbenye ndị chọrọ enyemaka site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ha nwere nʼike.”

11Ndị akaebe, ndị kwara obi nʼazụ na-apụkwute m;
ha na-ebo m ebubo ihe ndị m na-anụbeghị ihe banyere ha na mbụ.
12Ana m emere ha ihe ọma, ma ha na-akwụghachi m ihe ọjọọ.
Nke a na-ewute mmụọ m ruo nʼọnwụ.
13Mgbe ha na-arịa ọrịa, eyiri m akwa mkpe,
site na ibu ọnụ weda onwe m nʼala.
Mgbe ekpere m lọghachikwutere m na-enweghị ọsịsa,
14ejegharịrị m nʼọnọdụ iru ụjụ,
dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne m, maọbụ enyi m,
jegharịakwa nʼobi ọjọọ dịka a ga-asị
na ọ bụ nne m na-arịa ọrịa ahụ.
15Ma mgbe m dahiere, ha zukọtara na-aṅụrị ọṅụ;
mgbe m na-adịghị ele anya, ha biliri imegide m.
Ha na-ekwulu m na-esepụghị aka.
16Dịka ndị ajọ omume, ha na-akwa m emo nʼiwe,
na-atakwara m ikikere eze ha.

17O Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-ele ihe na-eme?
Gbapụta ndụ m site na mbibi ha niile,
site nʼaka ụmụ ọdụm ndị a, gbapụta ndụ m dị oke ọnụahịa.
18Aga m enye gị ekele nʼihu ọha mmadụ dị ukwuu,
nʼetiti ọha kachasị ibe ya dị ukwuu, ka m ga-anọ too gị.
19Ekwekwala ka ndị ahụ bụ ndị iro m,
mgbe o nweghị ihe m mere ha, chịa m ọchị;
ekwekwala ka ndị ahụ kpọrọ m asị nʼihi iro,
mgbe o nweghị ihe m mere ha nwee izuike.
20Nʼihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu,
kama ha na-echepụta ebubo ụgha dị iche iche
megide ndị ahụ na-anọrọ onwe ha jụụ nʼime ala ahụ.
21Nʼiju anya, ha na-ele m anya na-eti mkpu na-asị,
“Ewoo! Ewoo! Anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ya.”

22O Onyenwe anyị, ị hụla nke a, agbakwala nkịtị;
anọkwala m nʼebe dị anya, O Onyenwe anyị.
23Teta, bilie bụụrụ m onye mkpepụta m.
Kpechitere m ọnụ m, Chineke m na onyenwe m.
24O Onyenwe anyị Chineke m, kpepụta m nʼihi ezi omume gị;
ekwekwala ka ha chịa m ọchị.
25Ekwekwala ka ha sị, “Ahaa, ọ dị ka anyị tụrụ anya ya!”
Maọbụ sị, “Anyị eloola ya!”

26Mee ka ihere na ọgbaaghara
bụrụ nke ndị na-achị m ọchị nʼime mkpagbu m;
were ihere na nweda nʼala yinye ha dịka uwe,
bụ ndị niile na-ebuli onwe ha elu imegide m.
27Ka ndị niile mkpepụta m dị mma
were obi ụtọ tie mkpu ọṅụ;
ka ha na-asị mgbe niile, “Ka e bulie Onyenwe anyị elu,
onye ọdịmma nke ohu ya na-amasị.”

28Ire m ga-ekwu banyere ezi omume gị
na otuto gị niile ogologo ụbọchị niile.
Copyright information for IboBIU